2 Samuel 1

Devid anụ maka ọnwụ Sọl

1Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag. 2O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.

3Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?”

Nwoke ahụ zara sị, “Esi m nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel gbapụta.”

4Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.”

Nwoke ahụ zara sị, “Ndị agha Izrel niile agbaala ọsọ. Ọtụtụ nʼime ndị agha Izrel anwụọkwala. Sọl na Jonatan nwa ya nwụkwara!”

5Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”

6Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike. 7Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’

8“Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’

“Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’

9“Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’

10“Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”

11Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha. 12Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha Onyenwe anyị na ụlọ Izrel. Nʼihi na ha dara site na mma agha.

13Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?”

Ọ zara sị ya, “Abụ m onye ọbịa, onye Amalek.”

14Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye Onyenwe anyị tere mmanụ?”

15Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya. 16Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ ”

Abụ akwa Devid maka Sọl na Jonatan

17Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan. 18O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.

19“Ebube gị, gị Izrel, abụrụla ihe e gburu nʼebe gị niile dị elu.
Lee ka ndị bụ dike si daa!

20“Ekwutela ya na Gat.
Obodo Gat na Ashkelọn dị nʼala Filistia. 1Sa 6:17; 1Sa 27:2

Ekwusala ya nʼokporoụzọ Ashkelọn.
Otu obodo nʼime ala ndị Filistia Jer 25:20

Ka ada ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ.
Ka ụmụ inyom ndị a na-ebighị ugwu ghara iti mkpu ọṅụ.

21“Unu ugwu Gilboa,
ka igirigi maọbụ mmiri ozuzo ghara ịbịakwasị unu.
Ka mmiri ozuzo gharakwa izokwasị nʼaja mbuli elu unu.
Ka ubi unu dị nʼelu ugwu ghara ịmịpụta mkpụrụ

Nʼihi na nʼelu unu ka a nọ merụọ ọta
Ọ bụ akpụkpọ anụ a mịkpọrọ amịkpọ, nke e tere mmanụ ka e ji eme ọta. Ọ bụ mmanụ ahụ e teere ya, na-eme ka ọ ghara ịma ebu, meekwa ka ọ na-amị amị, i ji gbochie ka àkụ a gbara ghara imife nʼọta ahụ. Ma ọta ndị a, nʼihi na ha amịjuola ọbara nʼebe ọ dị ukwuu, ha adịghị abakwa uru ọta na-aba nʼoge agha.
ndị dị ike.
E, ọta Sọl, nke a na-adịghị etekwa mmanụ.

22“Site nʼọbara ndị e gburu egbu,
site nʼanụ ahụ ndị dị ike.
Ụta Jonatan alọghachighị azụ.
Mma agha Sọl agbaghịkwa aka lọghachi.
23Sọl na Jonatan,
na ndụ ha bụ ndị a hụrụ nʼanya. Ndị jupụtara nʼamara.
Ma nʼọnwụ, nkewa ọbụla adịghị nʼetiti ha.
Ha dị gara gara karịa ugo.
Ha dị ike karịa ọdụm.

24“Ụmụada
Maọbụ, Ụmụ ndị inyom Izrel.
Izrel,
kwaaranụ Sọl akwa.
Onye na-eji uwe uhie uhie chọọ unu mma.
Onye ji uwe na ihe ịchọ mma ọlaedo chọọ unu mma.

25“Lee ka ndị dị ike si daa nʼetiti ọgbọ agha.
E gbuola Jonatan nʼelu ugwu;
26ana m eruru gị ụjụ, gị Jonatan, nwanne m
nʼihi na ihe dị oke ọnụahịa ka ị bụụrụ m.
Ịhụnanya i nwere nʼebe m nọ dị omimi
karịa ịhụnanya ndị nwanyị.

27“Lee ka ndị dị ike si daa!
Ngwa agha niile abụrụla ihe lara nʼiyi!”
Copyright information for IboBIU